Luke 8:43 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌime igwe mmadụ a, o nwere otu nwanyị nọrọla nꞌọrịa afọ iri na abụọ. Ọrịa ọ na-arịa bụ ịgba ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị. O mefuola ego dị ukwuu nꞌaka ndị dibia dị iche iche, ma o nwebeghị onye nwere ike gwọọ ya.
Igbo 2006
Otù nwanyi nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, nke mefusiri ihe dum o ji biri n'aru ndi-dibia, ma ọ dighi onye ọ bula nwere ike ime ka aru-ya di ike,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma ọ dịghị onye nwere ike ịgwọ ya.