Luke 8:44 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O jisiri ike site nꞌetiti ndị mmadụ bịa nꞌazụ Jisọs metụ ọnụ uwe Jisọs aka. Otu mgbe ahụ o metụrụ uwe Jisọs aka, ọbara ahụ kwụsịkwara ịgba ọzọ.
Igbo 2006
nwanyi ahu we bia n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ngwa ngwa orùrù-ọbara-ya we guzo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O sitere nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. Ngwangwa, ọrịa oruru ọbara ahụ kwụsịkwara.