Luke 8:45 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị jụọ ajụjụ sị, “Onye metụrụ m aka?” Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya, Pita na ndị ọzọ so Jisọs gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, lee igwe mmadụ gbara gị gburugburu, ndị na-achọsi ike ịbịaru gị nso, ị sikwanụ aṅaa na-ajụ ajụjụ banyere onye metụrụ gị aka?”
Igbo 2006
Jisus we si, Ònye bu onye ahu nke meturum aka? Ma mb͕e madu nile di nāgo, Pita na ndi ya na ha yikọ si, Nna-ayi, ìgwè madu ndia nādagide Gi nākpab͕u kwa Gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị, “Onye metụrụ m aka?” Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya. Pita gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị.”