Luke 8:47 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime izo onwe ya, o jiri egwu na ahụ ịma jijiji bịa daa nꞌala nꞌihu Jisọs, kọọrọ ya ihe nile mere nꞌihu mmadụ nile. Ọ gwakwara Jisọs ihe mere o ji metụ ya aka.
Igbo 2006
Ma mb͕e nwanyi ahu huru na o zoghi ezo, o were ima-aru-jijiji bia, we da n'iru Ya, kọ n'iru ndi-Ju ahu nile ihe mere o ji metu Ya aka, na otú esi me ka aru di ya ike ngwa ngwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime iji zoo onwe ya, o ji ịma jijiji bịa daa nʼụkwụ ya. Nʼihu mmadụ niile, ọ kọrọ ihe mere o ji metụ ya aka na otu e sị gwọọ ya nʼotu ntabi anya.