Luke 8:49 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọ nọ na-agwa nwanyị ahụ okwu, otu onye sitere nꞌụlọ Jairọs bịarute ebe ahụ gwa Jairọs sị, “Nwa gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu.”
Igbo 2006
Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, otù onye si n'ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwayi anwuruwo; esob͕u-kwa-la Onye-ozizí a ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ.”