Luke 8:52 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌime ụlọ ahụ, Jisọs hụrụ ọtụtụ ndị nọ na-akwa akwa na-etikwa aka nꞌobi na mwute, nꞌihi ọnwụ nwanta nwanyị ahụ. Jisọs gwara ha sị, “Unu ebekwala akwa, nꞌihi na nwanta nwanyị a anwụghị anwụ, ọ bụ ụra ka ọ na-arahụ.”
Igbo 2006
Ma madu nile nākwa ákwá, nēti kwa aka n'obi n'ihi ya: ma Ọ siri, Unu akwala ákwá; n'ihi na ọ nwughi anwu, kama ọ nāraru ura.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. Ọ sịrị ha, “Unu ebezila akwa, nʼihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ nọ nʼụra.”