Luke 9:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ndị ahụ na-eso ụzọ Jisọs lọtara, ha kọọrọ Jisọs akụkọ ihe nile ha mere. Jisọs kpọọrọ ha ka ha soro ya gaa ebe ha ga-anọrọ onwe ha nanị ha. Ọ bụ obodo Betsaida ka ọ kpọọrọ ha gaa.
Igbo 2006
Mb͕e ndi-ozi Jisus latara, ha we kọrọ Ya ihe nile ha mere, ka ha ra. O we chiri ha tiyere Onwe-ya, wezuga Onwe-ya iche rue obodo anākpọ Betsaida.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ndị ozi a lọtara, ha kọọrọ ya ihe niile ha mere. Ọ kpọọrọ ha gaa nʼobodo a na-akpọ Betsaida ebe ha ga-anọ naanị ha.