Luke 9:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma mgbe ndị mmadụ nụrụ na Jisọs agaala Betsaida, ha sooro ya. Mgbe ha bịaruru ebe ahụ, Jisọs nabatara ha, gwa ha okwu gbasara alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nꞌetiti ha.
Igbo 2006
Ma mb͕e ìgwè madu nile mara ya, ha soro Ya: O we nara ha nke-ọma, we gwa ha okwu bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi ọ di nkpà ka eme ka aru-ha di ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. Ọ nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma.