Luke 9:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe anwụ bidoro ịda, nꞌoge anyasị, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ bịakwutere Jisọs gwa ya sị, “Zilaganụ ndị a, ka ha gaa nꞌime obodo chọọrọ onwe ha nri, na ebe ha ga-arahụ ụra. Ebe anyị nọ bụkwanụ ọzara.”
Igbo 2006
Ma chi malitere iji; ndi-ozi iri na abua ahu we biakute Ya, si Ya, Zilaga ìgwè madu a, ka ha we ga n'obodo ntà nile na ubi nile di buruburu, nọ ọnọdu-abali, chọta kwa ihe ha gēri; n'ihi na ayi nọ n'ebe a nime ọhia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe anwụ bidoro ịda, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ bịakwutere ya sị ya, “Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼime obodo na nʼobodo nta ndị gbara ebe a gburugburu, ka ha chọtara onwe ha nri na ebe ndina nʼihi na ebe a anyị nọ bụ ọzara.”