Luke 9:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu ụbọchị mgbe Jisọs nọ nanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka ndị mmadụ sị na m bụ?”
Igbo 2006
O rue, mb͕e nání Ya nọ nēkpe ekpere, ndi nēso uzọ-Ya nọyere Ya: O we jua ha, si, Ònye ka ọra madu nāsi na Mu onwem bu?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ụbọchị mgbe ọ nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka igwe mmadụ na-asị na m bụ?”