Luke 9:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Nꞌihi na onye ọ bụla ihere m ma ọ bụ ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa m mgbe m ga-abịaghachi nꞌebube nke Nna m, na nꞌebube ndị mmụọ ozi.
Igbo 2006
N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme, ihere onye ahu gēme Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke aka Ya, na ebube nke Nna-Ya, na ebube nke ndi-mọ-ozi-Ya di nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla ihere m na ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa Nwa nke Mmadụ mgbe ọ ga-abịa nʼebube ya, na nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.