Luke 9:33 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Mosisi na Ịlaịja bidoro isite nꞌebe Jisọs nọ na-apụ, Pita gwara Jisọs sị, “Nna anyị ukwu, ọ ga-adịkwanụ mma ma ọ bụrụ na anyị ga-anọ nꞌebe a. Ka anyị wuonụ ọnụ ụlọ atọ, otu nke gị, otu nke Mosisi na otu nke Ịlaịja.” Ma mgbe Pita na-ekwu ihe ndị a, ọ ghọtaghị ihe ọ na-ekwu.
Igbo 2006
O we rue, mb͕e ha si n'ebe Ọ nọ nēkewapu, Pita si Jisus, Nna-ayi, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Eliaja: n'ihi na ọ mataghi ihe ọ nēkwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha na-ahapụ ya, Pita sịrị Jisọs, “Nna anyị ukwu, ọ ga-adị mma ka anyị nọrọ ebe a ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ, otu ga-abụ nke gị, otu ga-abụ nke Mosis, otu ga-abụkwa nke Ịlaịja.” Ọ mataghị ihe ọ na-ekwu.