Luke 9:34 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Pita kpụ okwu ahụ nꞌọnụ, igwe ojii kpuchigidere ha. Egwu tụrụ Pita na Jọn na Jemes mgbe igwe ojii ahụ kpuchigidere ha.
Igbo 2006
Mb͕e ọ nēkwu okwu ndia, igwe-oji we bia, kpuchie ha: ha we tua egwu mb͕e ha nābà n'igwe-oji ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Egwu tụkwara ha dị ka ha na-aba nʼigwe ojii ahụ.