Luke 9:39 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mmụọ ọjọọ na-abịa jide ya na-eme ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-enugharịkwa ya na-eme ka ọ na-agbọ ụfụfụ nꞌọnụ. Mgbe mmụọ ọjọọ a mesịrị nke a laa, ike afụ anaghị adịkwa nwanta a.
Igbo 2006
le kwa, ajọ mọ nējide ya, o we nēti nkpu na mberede; ajọ mọ ahu nēse kwa ya, me ka ọ nāsu ufufu n'ọnu, o ji kwa ike arapu ya, nēchihia ya aru nke-uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ ọjọọ na-ejide ya mee ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-atụda ya nʼala, na-ese ya ese, na-adọkwa ya adọ mee ka ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ. Ọ dịghị mgbe ọ na-ahapụ ya kama ọ na-echihịasị ya ahụ.