Luke 9:41 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs zara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Unu bụ nnọọ ndị ekweghị ekwe na isi ike juru obi! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ m na-anagide ekweghị ekwe unu?” Mgbe ahụ ọ gwara nna nwanta ahụ sị, “Kpọtara m nwanta ahụ nꞌebe a!”
Igbo 2006
Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ, ewem nagide kwa unu? kuta nwa-gi n'ebe a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs zara sị, “Leenụ ọgbọ rụrụ arụ, nke na-enweghị okwukwe! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ, ruokwa olee mgbe ka m ga-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwa gị nwoke ahụ nʼebe a!”