Luke 9:42 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe nna nwanta ahụ du nwanta ahụ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwaturu ya nꞌala nugharịa ya. Ma Jisọs nyere mmụọ ọjọọ ahụ iwu ka o si nꞌime nwanta ahụ pụta. Ọ gwọrọ nwanta ahụ kpọnyekwa ya nna ya.
Igbo 2006
Mb͕e ọ nọ nābiakute Ya, mọ ọjọ ahu we tuda ya n'ala, sesie ya ike. Ma Jisus bara mọ ahu nādighi ọcha nba, we me ka aru nwa-okoro ahu di ike, O we kuru ya nyeghachi nna-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwadara ya nʼala sesie ya ike, ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba. Ọ gwọrọ nwata ahụ kpọnyekwa ya nna ya.