Luke 9:48 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ọ bụla nabatara nwanta a nꞌaha m, nabatara m. Onye ọ bụla kwa nabatara m, nabatara Chineke onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nꞌetiti unu bụ onye ka ibe ya ukwuu.”
Igbo 2006
we si ha, Onye ọ bula nke gānara nwatakiri a nke-ọma n'aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma nānara Onye ziputaram nke-ọma: n'ihi na onye dikari ntà n'etiti unu nile, onye ahu bu onye uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gwara ha sị, “Onye ọbụla nabatara nwata a nʼaha m, nabatara m. Onye ọ bụlakwa nabatara m, nabatara onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nʼetiti unu bụ onye kachasị ukwuu.”