Luke 9:54 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Jemes na Jọn hụrụ na ndị Sameria jụrụ ịnabata Jisọs, ha gwara Jisọs sị, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nꞌeluigwe bịa laa ha nꞌiyi?”
Igbo 2006
Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya, bú Jemes na Jọn, huru nka, ha si, Onye-nwe-ayi, Ì nāchọ ka ayi si ọku site n'elu-igwe da, rechapu ha?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jemis na Jọn ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nʼeluigwe bịa laa ha nʼiyi?”