Malachi 1:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ahuwom unu n'anya, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka I huworo ayi n'anya? Isọ, ọ̀ bughi nwa-nne Jekob? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): otú ọ di, anamahu Jekob n'anya;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ahụla m unu nʼanya,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Olee ụzọ i si hụ anyị nʼanya?’ “Ịsọ, ọ bụghị nwanne Jekọb?” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma otu ọ dị, ahụrụ m Jekọb nʼanya,