Malachi 1:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nwa nāsọpuru nna-ya, orù nāsọpuru kwa onye-nwe-ya: ọ buru kwa na nna ka M'bu, òle ebe nsọpurum di? ọ buru kwa na onye-nwe-madu ka M'bu, òle ebe egwum di? ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri unu, unu ndi-nchu-àjà, ndi nēlelì aham. Ma unu asiwo, Nìme gini ka ayi lelìworo aha-Gi?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nwa na-asọpụrụ nna ya, ohu na asọpụrụkwa onyenwe ya. A sị na m bụ nna, ebee ka egwu m dị. A sị na m bụ onyenwe mmadụ, ebee ka nsọpụrụ m dị?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Ọ bụ unu ndị nchụaja na-eleda aha m anya. “Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si eleda aha gị anya?’