Malachi 1:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọzọ, mḅe unu nēweta anu kpuru ìsì nso, ihe ọjọ adighi ya! mḅe unu nēweta nso nke gwọrọ ngwurọ na nke nāria ọria, ihe ọjọ adighi ya! Biko, weta ya nso onye nāchi ala-gi; ìhe-gi gātọ ya utọ? ma-ọbu ọ̀ gāhu gi iru-ọma? otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe unu ji anụ ndị kpuru ìsì achụrụ m aja, ọ bụghị ihe na-ezighị ezi ka unu na-eme? Mgbe unu na-ejikwa ndị dara ngwụrọ, na anụ na-arịa ọrịa, ọ bụghị ihe ọjọọ ka unu na-eme? Werenụ anụ ndị a bugara onye na-achị obodo unu dịka onyinye. Ọ ga-atọ ya ụtọ ịnabata onyinye dị otu a? Ọ ga-anabata unu?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.