Malachi 2:16 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na Ọ kpọwo nchupu-nwunye asì, otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, ya na onye ji ihe-ike ekpuchi uwe-ya, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: n'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka unu we ghara ighọḅu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ Onyenwe Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.