Malachi 4:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na, le, ubọchi ahu nābia, ọ nēre dika ite-ọku uku; ndi-nganga nile na onye ọ bula nke nēme ihe-nmebi-iwu gābu kwa ahihia-ọka: ubọchi ahu nke nābia gērechapu ha, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ọ gaghi-arapu-kwa-ra ha nkpọrọgwu ma-ọbu alaka.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼezie, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ ga-erekwa ọkụ dịka ebe a funyere ọkụ buru ibu. Mgbe ndị nganga, ndị na-eme ihe ọjọọ, ga-abụ igbugbo ọka, ụbọchị ahụ na-abịa ga-erechapụ ha,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Ọ dịkwaghị mgbọrọgwụ maọbụ alaka ọbụla ga-afọdụrụ ha.