Mark 1:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ebe ahụ ka ọ ga-anọ iri ụbọchị anọ ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Nanị ya nọ nꞌebe ahụ, mmadụ ọ bụla anọkwaghị ya, kariakwa ụmụ anụ ọhịa. Ma ndị mmụọ ozi bịakwara nyere ya aka.
Igbo 2006
O we nọ n'ọhia ọgu ubọchi abua, Setan nānwa Ya; Ya na anu ọhia nile nọ kwa; ndi-mọ-ozi nēje-kwa-ra Ya ozi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ nọkwara nʼime ọzara ahụ iri ụbọchị anọ, ebe ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa nọkwa. Ma ndị mmụọ ozi jeere ya ozi.