Mark 1:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Jisọs hapụrụ ebe ahụ gatụ nꞌihu nke nta, ọ hụrụ Jemes na Jọn nwanne ya. Ha abụọ bụ ụmụ Zebedi. Ha bụkwa ndị ọkụ azụ. Nꞌoge Jisọs hụrụ ha ha nọ na-adụchi ụgbụ ha dọkara adọka.
Igbo 2006
Mb͕e Ọ gara n'iru nke-ntà, O we hu Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, ndi nọ kwa n'ub͕ọ, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ gatụrụ nʼihu nke nta, ọ hụrụ Jemis nwa Zebedi na nwanne ya bụ Jọn ndị nọ nʼime ụgbọ mmiri, na-ekezi ụgbụ azụ ha.