Mark 1:34 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs pụtara nꞌezi gwọọ ndị nile ọrịa dị iche iche na-arịa. Ọ chụpụkwara mmụọ ọjọọ site nꞌahụ ndị ọ na-enye nsogbu. Ebe ọ bụ na mmụọ ọjọọ ndị a maara onye Jisọs bụ, o kweghị ka ha kwuo okwu ọ bụla mgbe ọ na-achụpụ ha.
Igbo 2006
O we me ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi aru nādighi nma n'ọria di iche iche, Ọ chupu kwa ọtutu ndi-mọ ọjọ; O kweghi kwa ndi-mọ ọjọ kwue okwu, n'ihi na ha matara Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ.