Mark 1:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nwoke ahụ Chineke zitere bụ Jọn omee baptizim. O bi nꞌọzara, sitekwa nꞌebe ahụ jegharịa ebe nile. Ọ na-akpọku ndị mmadụ ka ha site na mmehie ha chegharịa, ka e mee ha baptizim, ka Chineke gbaghara ha.
Igbo 2006
Jọn putara ìhè, onye nēme baptism n'ọhia, nēkwusa kwa baptism nchèghari inwe nb͕aghara nmehie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.