Mark 1:44 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Lee, agwakwala onye ọ bụla banyere ọgwụgwọ m gwọrọ gị. Kama laa ugbu a, gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Imekwa ka ndị ọzọ mata na a gwọọla gị gaa nye onyinye dị ka Mosisi nyere nꞌiwu na ndị a gwọrọ ọrịa ekpenta ga-enye.”
Igbo 2006
si ya, Lezi anya ka i ghara igwa onye ọ bula okwu ọ bula: ma laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha nke Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ọ gwara ya sị, “Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”