Mark 1:45 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma nwoke ahụ lara kọsaa akụkọ ọgwụgwọ ya ebe nile. Nꞌihi nke a ọtụtụ mmadụ gbara Jisọs gburugburu. Nke a mere ka o siere Jisọs ike ịbanye nꞌobodo ọ bụla mgbe ìhè dị. Ya mere, ọ nọdụrụ nꞌebe ndị mmadụ na-ebighị. Ma ọtụtụ igwe mmadụ sitekwara ebe nile bịakwute ya nꞌebe ahụ.
Igbo 2006
Ma ọ puru, malite ikwusazu ya, na ifesa okwu ahu, nke mere na O nweghi ike ọzọ ibà nime obodo n'iru ọra, kama Ọ nọ n'azu obodo n'ebe bu ọhia: ha we si n'ebe nile nābiakute Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ pụrụ malite ịkọsa akụkọ banyere ọgwụgwọ ya ebe niile. Nʼihi ya Jisọs enwekwaghị ike ịbanye nʼobodo, kama ọ gara nọrọ nʼebe zoro ezo. Ma ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya site nʼebe niile dị iche iche.