Mark 1:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọtụtụ mmadụ sitere Judia na obodo nile dị Jerusalem gburugburu bịakwute ya. Ha jekwuuru ya nꞌosimiri Jọdan ebe ọ nọ na-ekwusa nkwusa ya. Mgbe ha kwupụtasịrị mmehie ha o mere ha baptizim.
Igbo 2006
Ala Judia nile na ndi Jerusalem nile nāpukuru ya; ọ neme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.