Mark 1:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Uwe Jọn yi nꞌahụ ya bụ nke e mere site nꞌajị inyinya a na-akpọ kamel. O kekwara belịtị dị warara nꞌukwu ya. Nri ọ na-eri bụ nanị igurube na mmanụ aṅụ a na-azaghị aza.
Igbo 2006
Jọn nēyi aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya, nēri kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.