Mark 10:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma mgbe Jisọs hụrụ ihe a ndị na-eso ụzọ ya mere, o wutere mmụọ ya. Ọ baara ha mba sị, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nꞌihi na alaeze Chineke dịịrị ndị dị otu a.
Igbo 2006
Ma mb͕e Jisus huru ya, iwe were Ya nke-uku, Ọ si ha, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem; unu eb͕ochila ha: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe Jisọs hụrụ nke a, iwe were ya nke ukwuu, ọ sịrị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a.