Mark 10:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma banyere ajụjụ ị jụrụ m, ị maara ihe banyere iwu ndị a nke na-asị, egbula mmadụ, akwala iko, agbala ama ụgha, aghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nna gị na nne gị?”
Igbo 2006
I matawo ihe nile enyere n'iwu, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Emeb͕ula madu, Sọpuru nna-gi na nne-gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’ ”