Mark 10:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs lere nwoke ahụ anya, hụ ya nꞌanya. Mgbe ahụ ọ gwara nwoke ahụ sị, “Ọ fọdụrụ nanị otu ihe ị ga-eme. Laa ugbu a, ree ihe nile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. I mesịa nke a, ị ga-enwe akụ nꞌeluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.”
Igbo 2006
Ma mb͕e Jisus lere ya anya Ọ hu ya n'anya, si ya, Otù ihe fọduru gi ime: laba, re ka ihe i nwere ra, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs lere ya anya, hụ ya nʼanya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ọ fọdụrụ naanị otu ihe ị ga-eme. Laa, ugbu a, ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. I mesịa nke a, ị ga-enwe akụ nʼeluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.”