Mark 10:29 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs zara ya sị, “Ana m agwa gị eziokwu, ọ dịghị onye ọ bụla hapụrụ ụlọ ya, ụmụnne ya nwoke, ụmụnne ya nwanyị, nne ya, nna ya, ụmụ ya, na ala ubi ya nꞌihi m, na nꞌihi ozi ọma a,
Igbo 2006
Jisus siri, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne-ndikom, ma-ọbu umu-nne-ndinyom, ma-ọbu nne, ma-ọbu nna, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n'ihim, na n'ihi ozi ọma nkem,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a,