Mark 10:32 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha nọ nꞌụzọ na-aga Jerusalem mgbe ihe ndị a na-eme. Jisọs kpo ihu, ndị na-eso ụzọ ya egwu juru obi so ya nꞌazụ. Otu a kwa ndị mmadụ nile na-abịa ha nꞌazụ tụkwara ụjọ. Ọzọ kwa, Jisọs kpọọrọ ndị na-eso ụzọ ya pụọ nꞌebe ndị mmadụ nọ bido na-agwa ha ihe na-akwado ịdakwasị ya.
Igbo 2006
Ma ha nọ n'uzọ, nārigoro Jerusalem; Jisus we nāga n'iru ha: ibobo nwu-kwa-ra ha n'aru; ma ndi nēso Ya nātu egwu. O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya ọzọ, malite igwa ha ihe nile gaje ime Ya,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha nọ nʼụzọ na-aga Jerusalem, ma Jisọs nọ nʼihu ha, nke a juru ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Otu a kwa, ndị mmadụ niile na-abịa ha nʼazụ tụkwara egwu. Ọzọkwa, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ nʼakụkụ, malite ịgwa ha ihe gaje ịdakwasị ya.