Mark 10:46 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ ha ruru Jeriko. Mgbe ha nọtụsịrị nꞌebe ahụ, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya, na ọtụtụ igwe mmadụ bidoro isite nꞌobodo ahụ pụọ. Ma o nwere otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs, nke pụtara nwa Timiọs, onye nọ nꞌakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ.
Igbo 2006
Ha we bia rue Jeriko: mb͕e Ọ nāputa na Jeriko, Ya na ndi nēso uzọ-Ya na oké ìgwè madu, nwa-nwoke Timiọs, bú Bātimiọs, onye-aririọ kpuru ìsì, nānọdu n'akuku uzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha ruru Jeriko, dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ sitere nʼobodo Jeriko na-apụ, otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs (aha ya pụtara “nwa nwoke Timiọs”), onye arịrịọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ.