Mark 11:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Site nꞌebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiigi nꞌihu ya nke nwere ahịhịa ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gara nꞌukwu ya ile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nꞌelu ya. Mgbe o ruru nꞌukwu osisi ahụ, ọ hụghị mkpụrụ ọ bụla, nanị ahịhiạ ndụ, nꞌihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ.
Igbo 2006
Mb͕e Ọ huru osisi fig n'ebe di anya nke nwere akwukwọ ndu, Ọ bia, ma ebe ọ di otú a Ọ gāhu ihe n'elu ya: ma mb͕e Ọ biaruru ya aru, Ọ hughi ihe ọ bula ma-ọbughi akwuwọ ndu: n'ihi na ọ bughi oge nkpuru fig.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site nʼebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiig nke nwere akwụkwọ ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gagharịrị nʼukwu ya niile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla, naanị akwụkwọ ndụ, nʼihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ.