Mark 11:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha sitere nꞌebe ahụ pụọ na-aga nꞌihu nꞌije ha ịga Jerusalem. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Jisọs banyere nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke, bido ịchụpụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa nꞌebe ahụ. O kpugharịrị tebulu ndị na-agbanwe ego, kwatuokwa ọdụ ahịa ndị na-ere nduru.
Igbo 2006
Ha we bia rue Jerusalem: O we ba n'ulo uku Chineke, malite ichupu ndi nēre na ndi nāzu n'ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nteke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha ruru Jerusalem, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu, bido ịchụpụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa nʼebe ahụ. O kpugharịrị tebul ndị na-agbanwe ego, kwatuokwa oche niile nʼọdụ ahịa ndị na-ere nduru.