Mark 11:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ ihe Jisọs kwuru, ha bidoro ịchọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Ha tụrụ egwu na Jisọs pụrụ ime ka ọgba aghara bido, nꞌihi na ọtụtụ mmadụ na-anabata okwu ya nke ọma.
Igbo 2006
Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nu ya, ha we nāchọ uzọ ha gēsi la Ya n'iyì: n'ihi na ha nātu egwu Ya, n'ihi na ibobo ozizí-Ya nwuru ìgwè madu nile n'aru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ nke a, ha malitere na-achọ ụzọ igbu ya ma ha tụrụ egwu ya nʼihi na ozizi ya juru igwe mmadụ niile ahụ anya.