Mark 12:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịkọrọ ndị mmadụ ahụ akụkọ. Nke a bụ otu nꞌime akụkọ ọ kọọrọ ha. “Otu nwoke kụrụ mkpụrụ vaịnị nꞌubi ya, jiri mgbidi gbaa ubi ahụ gburugburu. O wukwara mbadamba ala ebe a ga-anọ na-apịpụta mmiri vaịnị ahụ, wuokwa ụlọ ebe ndị nche ga-anọ. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o nyefere ubi ahụ nꞌaka ụfọdụ mmadụ ka ha lekọtaa ya anya.
Igbo 2006
O we malite igwa ha okwu n'ilu. Otù onye kuru ubi-vine, ọ b͕a ya ogige gburugburu, gwu kwa ebe inara manya agāzọchapu na nkpuru-vine, o wu-kwa-ra ulo-elu, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ọ bidoro ịgwa ndị ahụ okwu nʼilu sị, “Otu nwoke kụrụ mkpụrụ vaịnị nʼubi ya, jiri mgbidi gbaa ubi ahụ gburugburu. O gwuru ebe ịnara mmanya si na mkpụrụ vaịnị, wuokwa ụlọ elu. Mgbe o mesịrị, o nyefere ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọrụ ubi ilekọta ya ma gaa obodo ọzọ.