Mark 12:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị a bịakwutere Jisọs sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ nwoke na-ekwu eziokwu na-atụghị egwu. Ị dịghị echegbu onwe gị banyere ihe ndị mmadụ na-ezu megide gị, nꞌihi na ị naghị ele mmadụ anya nꞌihu. Kama ị ji obi ọcha na-ezi otu mmadụ ga-esi mee ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ma ugbu a, anyị chọrọ ka ị gwa anyị, o ziri ezi ịtụ ụtụ nye Siza, ka o zighị ezi.
Igbo 2006
Ha we bia, si Ya, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru, kama I nēzi uzọ Chineke n'ezi-okwu: ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha bịakwutere ya, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye eziokwu, ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ, kama ị na-ezi ụzọ Chineke nʼụzọ eziokwu. O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza ka ọ bụ na o zighị ezi?