Mark 12:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs zara ha sị, “Nyenụ Siza ihe ruuru Siza. Ma nyekwanụ Chineke ihe ruuru ya.” Ọsịsa Jisọs juru ndị mmadụ nọ nꞌebe ahụ anya.
Igbo 2006
Jisus we si ha, Nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke. O we ju ha nile anya nke-uku bayere Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nyenụ Siza ihe bụ nke ya, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke ya.” Ọsịsa ya jụkwara ha anya.