Mark 12:28 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu nꞌime ndị ozizi iwu bịara nꞌebe ahụ nꞌoge ha na-ekwu okwu ahụ, guzo gee ntị nꞌihe ha na-ekwu. Mgbe ọ hụrụ na Jisọs nyere ndị Sadusii ahụ ezi ọsịsa, ọ jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Nꞌime iwu nile olee nke kachasị mkpa?”
Igbo 2006
Otù onye nime ndi-ode-akwukwọ bia-kwa-ra, we nu ka ha nājurita onwe-ha ajuju, ma ebe ọ matara na Ọ zarari ha nke-ọma, ọ jua Ya, si, Òle nke bu nke-mbu n'ihe nile enyere n'iwu?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu nʼime ndị ozizi iwu bịara nʼoge ahụ ha na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na o nyere ha ezi ọsịsa, ọ jụrụ ya sị, “Nʼime iwu niile olee nke kachasị mkpa?”