Mark 12:36 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Devidi nꞌonwe ya sitere nꞌike Mmụọ Nsọ kwuo sị, ‘Chineke gwara Onyenwe m okwu sị ya, nọdụ nꞌakụkụ m tutuu ruo mgbe m mere ka ndị iro gị bụụrụ gị ihe ịtụkwasị ụkwụ.’
Igbo 2006
Devid onwe-ya siri nime Mọ Nsọ, Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Devid nʼonwe ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ kwuo sị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’