Mark 12:37 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Devidi nꞌọnwe ya kpọrọ Onye nzọpụta a Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ Onye nzọpụta siri bụrụ nwa Devidi?” Ụdị okwu a tọrọ ndị na-ege Jisọs ntị ụtọ nꞌobi. O mekwara ka ha gezie ntị nke ọma.
Igbo 2006
Devid onwe-ya nākpọ Ya Onye-nwe-ya; òle ebe O si buru kwa Nwa-ya? Oké ìgwè madu ahu we were obi-utọ nu okwu-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Devid nʼonwe ya kpọrọ ya Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ o si bụrụ nwa ya?” Igwe mmadụ ahụ jiri obi ụtọ na-ege ya ntị.