Mark 12:44 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ndị ọzọ sitere nꞌịba ụba nke ego ha nwere tụnye, ma nwanyị a tụnyere ego nile o nwere nꞌụlọ ya.”
Igbo 2006
n'ihi na ha nile sitere n'inwebiga-àkù-ókè-ha tubà; ma nwanyi ahu sitere n'ukọ-ya tubà ka ihe nile nke o nwere ra, bú ihe dum o ji biri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ndị ọzọ sitere nʼịba ụba nke ego ha nwere tinye, ma nwanyị a sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o nwere, ọ bụladị ihe niile o ji biri.”