Mark 13:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nꞌụlọ ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji sara ọnụ unu. Kama gwanụ ha ihe ọ bụla Chineke tinyere nꞌọnụ unu ikwu nꞌoge ahụ. Nꞌihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nꞌọnụ unu kwuo okwu.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ bula ha duru unu je ikpé, rara kwa unu nye, unu ebula uzọ nēcheb͕u onwe-unu okwu unu gēkwu: kama okwu ọ bula agēnye unu n'oge hour ahu, kwuenu nke ahu: n'ihi na ọ bughi unu onwe-unu nēkwu, kama ọ bu Mọ Nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nʼụlọikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, kwuonụ naanị ihe batara unu nʼọnụ unu ikwu nʼoge ahụ. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu.