Mark 13:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Mgbe unu hụrụ ihe arụ ahụ ka o guzo nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke, ka onye na-agụ ghọta ihe nke a pụtara, gbalaganụ! Gbaranụ ọsọ gaa nꞌugwu Judia!
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ n'efu, ka ọ nēguzo n'ebe ọ nēkwesighi (onye nāgu, ya tugharia uche), mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi ka ọ na-eguzo nʼebe ọ na-ekwesighị (onye na-agụ ya nwee nghọta), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu