Mark 13:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na ahụhụ nke ụbọchị ndị ahụ ga-adị ukwuu karịa ahụhụ ọ bụla mmadụ hụrụla site na mgbe ụwa bidoro. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo 2006
N'ihi na mb͕e ahu gābu nkpab͕u, nke aha nkpab͕u di otú a akādighi site na nmalite òkìkè-uwa nke Chineke kère rue mb͕e a, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na oke mkpagbu nke ụbọchị ahụ ga-abụ nke na-adịbeghị na mbụ site na mgbe Chineke kere ụwa ruo ugbu a. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.